Edit this page on GitHub (opens in a new tab)
…Cryptocurrency na-ekpughere ọha ihe niile ị na-emefu ebe ọ dị ka Twitter na akaụntụ ụlọ akụ gị, nke a bụkwa nnukwu nsogbu a ga-edozi site n'ịnakwere Nzuzo [privacy] on-chain.… - Ian Miers na Devcon4.
Ụfọdụ ọrụ crypto enwetala amara maka ụzọ ha si etinye Nzuzo n'isi. Zcash bụ onye a ma ama maka iji Zero Knowledge Proofs (ZK) chebe ego Azụmahia [transaction] na Adreesị akpa ego [address]. Monero pụtara ìhè n'ihi iji ya mee ka onye na-ezipụ ego ghara ịmata nke ọma dabere na Decoy, tinyere atụmatụ Nzobe ederede [encryption] ndị ọzọ iji nweta Nzuzo onye ọrụ na blockchain [blockchain].
| Zcash (zero-knowledge proofs) | Decoy-based (e.g. Monero RingCT) | |
|---|---|---|
| Core idea | A zk-SNARK proves a transaction is valid without revealing the sender, receiver or amount. | Real inputs are mixed with decoys, and range proofs show the amount is spendable. |
| What stays visible | Shielded transaction details stay confidential. | Encrypted inputs stay visible, and the flow of transactions between users can still be gathered. |
| Anonymity set | All transactions that ever occurred in the same shielded pool. | Depends on the number of real users on the network. |
Zero Knowledge Proofs bụ sistem cryptographic nke na-enye otu akụkụ (onye na-egosi proof) ohere igosi akụkụ ọzọ (onye na-enyocha ya) na okwu bụ eziokwu n'ekpugheghị ozi ọ bụla dị n'okpuru banyere okwu ahụ n'onwe ya. N'ọnọdụ Zcash, a na-eji ZK proofs chọpụta na Azụmahia ziri ezi n'ekpugheghị nkọwa Azụmahia dịka ONYE ZIGARA, ONYE NATABARA, ma ọ bụ EGO Azụmahia.
Nke a na-eme ka Nzuzo onye ọrụ dịgide, n'ihi na Azụmahia na-anọgide na nzuzo ma a ka na-akwado na ọ ziri ezi. E mepụtara teknụzụ a iji hụ na Azụmahia ego na netwọk Zcash na-adị nzuzo.
Na sistem dabere na Decoy dịka RingCT, a na-ejikọta ọtụtụ Azụmahia ọnụ, nke na-eme ka ịchọpụta ezigbo ebe ego si na ebe ọ na-aga sie ike. Algorithm ahụ na-etinye input na output Decoy n'ime Azụmahia, ma na-ejikwa Nzobe ederede nke Adreesị akpa ego eji eme input na Range proofs iji kwado na ego ebufere nwere ike imefu.
Ụzọ a na-eme ka ụzọ Azụmahia ghara ịdị mfe ịmata. Iji input Decoy na-eme ka ọ sie onye ọ bụla na-enyocha blockchain ike ịchọpụta ezigbo onye zigara, onye natara, ma ọ bụ ego Azụmahia.
Ihe Dị Mkpa A Ga-Ama: Usoro a nke ichekwa Nzuzo Azụmahia on-chain ka na-ekpughere input e zoro ezo nke Azụmahia ndị ọrụ niile. A ka nwere ike ịchịkọta metadata dịka MBUFỤT AZỤMAHIA n'etiti ndị ọrụ dị iche iche na netwọk. Ọ bụrụ na onye mmegide sonye n'ịmepụta Azụmahia na netwọk, nke ahụ na-eme ka input Decoy nke ndị ọrụ ndị ọzọ ghara inwe aha nzuzo.
Ma Zcash na Monero bụ cryptocurrency lekwasịrị anya na Nzuzo, mana ha na-enweta Nzuzo n'ụzọ dị iche iche.
Ndị a bụ ụfọdụ uru zero-knowledge proofs (ZK) nke Zcash nwere karịa sistem Decoy nke Monero:
Ọ bụ ezie na algorithm Decoy nke Monero (ring signature) na-enyere aka inye Nzuzo, ọ naghị enye Mpughe ahọpụtara n'otu ụzọ ahụ.

Nlele Nhọrọ: Zcash na-enye ndị ọrụ ohere ịhọrọ n'etiti Azụmahia Oha [transparent] (nke na-adịghị na nzuzo) na Azụmahia nke e chebere echebe (nke dị na nzuzo). Nke a pụtara na Zcash na-enye ndị ọrụ mgbanwe ịhọrọ idobe ozi ego ha na nzuzo (nke e chebere echebe) ma ọ bụ ime ka ọ bụrụ Oha ma onye ọ bụla hụ ya, dịka ọtụtụ blockchain ndị ọzọ, dịka akọwara na Zcash weebụsaịtị gọọmenti. Nzuzo a a na-ahọrọ itinye na-enye mgbanwe ka ukwuu na Ojiji [use case] metụtara azụmahịa/nzukọ, ebe ụfọdụ Azụmahia nwere ike ịchọ Nzuzo dị ntakịrị maka nyocha ọha, ebe ndị ọzọ na-erite uru na Nzuzo ka mma.
Ntọala Amaghị Aha: ntọala amaghị aha nke pool nke e chebere echebe nke zero knowledge nwere Azụmahia niile meworo mgbe ọ bụla. Nke a dị ukwuu karịa ọtụtụ usoro on-chain ndị ọzọ maka ime ka Azụmahia bụrụ Ihe na-apughi ijikọ ọnụ [unlinkable]. Rịba ama: nke a na-emetụta naanị Azụmahia dị n'ime otu pool nke e chebere echebe.
Iji Decoy na-eme ka ntọala amaghị aha bawanye. Agbanyeghị, ụzọ a dabere kpamkpam na ọnụ ọgụgụ ndị ọrụ ezigbo nọ na netwọk.
Enweghị Trusted Setup: Setup nke Zcash Sprout na Sapling jiri mgbakọ ọtụtụ akụkụ a maara dịka …emume trusted setup [trusted setup]…. Nkwalite NU5 ọhụrụ achọghị ntụkwasị obi ọ bụla n'ịdị mma nke setup circuit zero knowledge. Gụọ ECC blọọgụ gbasara NU5.
Nzuzo Data: Teknụzụ zk-SNARK eji na pool nke e chebere echebe nke Zcash na-enye nchekwa ka mma nke ukwuu maka ndị ọrụ. Mbelata mwepụta metadata on-chain pụtara na ndị ọrụ nọ na nchekwa pụọ n'aka ndị mmegide dịka ndị ohi kọmputa nwere ike ịdị ma ọ bụ òtù ọchịchị na-emegbu mmadụ.
E nwere ọtụtụ ọnọdụ ebe achọpụtara ntụpọ n'ime algorithm ịhọrọ Decoy nke Monero. Ntụpọ ndị a nwere ike ikpughe ego ndị ọrụ mefuru, dịka akụkọ sitere na CoinDesk siri kwuo.
Na nchịkọta, ihe kacha mkpa bụ ibelata ma ọ bụ iwepụ mwepụta ozi na data onye ọrụ, dịka Zooko kọwara na nnọkọ AMA dị ndụ Orchid (priv8)
Njikọ Ntụtụaka
https://www.getmonero.org/get-started/what-is-monero/
https://electriccoin.co/blog/zcash-evolution/
https://web.archive.org/web/20240327000137/https://electriccoin.co/zcash-metrics/ https://electriccoin.co/blog/viewing-keys-selective-disclosure/