Edit this page on GitHub (opens in a new tab)
Dịka ọ dị ugbu a, e nwere ụdị Adreesị akpa ego [address] na Azụmahia [transaction] abụọ na Zcash: nke e chebere echebe na Oha. Ihe dị iche n'etiti ZEC nke e chebere echebe na nke Oha dị mfe nke ukwuu. ZEC nke e chebere echebe na-edobe ego gị na azụmaahịa gị na nzuzo, ebe ZEC nke Oha na-arụ ọrụ dịka Bitcoin, n'ụzọ ghere oghe kpamkpam. Nke a pụtara na mmadụ nwere ike ịhụ nguzozi gị na azụmaahịa gị niile ma ọ bụrụ na ha maara Adreesị akpa ego gị.
Mgbe ndị mmadụ malitere iji ZEC nke mbụ, ha nwere ike ghara ịmata ụdị Adreesị akpa ego ha na-eji. Nke a bụ n'ihi na ọ bụghị exchange niile na-akwado ZEC nke e chebere echebe na/ma ọ bụ iwepụ ZEC nke e chebere echebe.
Ya mere, dịka ọmụmaatụ, ọ bụrụ na mmadụ ejiri Coinbase zụta ZEC, ha ga-azụta ZEC nke Oha ma nwee ike iwepụ naanị ZEC ahụ gaa na Adreesị akpa ego nke Oha dị na e-akpa ego [wallet]. E-akpa ego dịka Zodl nwere ike ichebe ego ezitere na Adreesị akpa ego nke Oha iji dozie nke a, mana ọ bụghị onye ọ bụla maara nke ahụ. N'ikwu ya n'ụzọ dị mfe, ọtụtụ mmadụ na-eji ZEC n'ụzọ exchange ha ma ọ bụ e-akpa ego ha bụ isi kwere ha.
Anyị na-atụ aro ka onye ọ bụla jide ZEC nke ya n'onwe ya. Nke ahụ pụtara ibugharị ZEC gị site na exchange gaa na e-akpa ego. Ụzọ kacha mma isi mata ma ị na-eji ZEC nke e chebere echebe, ya bụ nke nzuzo, bụ ilele Adreesị akpa ego nguzozi ahụ dị na ya. Ọ bụrụ na Adreesị akpa ego ahụ amalite na "z" ma ọ bụ "u1", nguzozi gị bụ nke e chebere echebe. Ọ bụrụ na Adreesị akpa ego ahụ amalite na "t", nguzozi ahụ bụ nke Oha.
N'ozuzu, e nwere ụzọ abụọ isi nweta ZEC nke e chebere echebe.
Site na exchange na-akwado iwepụ ego nke e chebere echebe:
Site na exchange na-akwado iwepụ ego nke Oha:
Nke a bụ nkuzi maka otu esi ewepụ ZEC na exchange. Rịba ama na nke a bụ iwepụ ego nke e chebere echebe.
Nke a bụ nkuzi maka otu esi echebe ZEC gị site na Adreesị akpa ego nke Oha gaa na Adreesị akpa ego nke e chebere echebe.
Nke a bụ nkuzi maka otu esi azụ ZEC na Coinbase ma ziga ya na Zodl.
Mgbe ijidechara n'aka na ZEC gị dị na e-akpa ego nke e chebere echebe na-akwado Adreesị akpa ego nke e chebere echebe, ị nwere ike ikpebi ma ịchọrọ iji ZEC ahụ mee azụmaahịa. Iji ZEC eme azụmaahịa dị nnọọ mfe. Ị nwere ike iziga ZEC gaa na Adreesị akpa ego nke e chebere echebe ma ọ bụ nke Oha dabere na mmasị onye ahụ. Dịka ọ dị na azụmaahịa ego ọ bụla, e nwere obere ohere na mmadụ nwere ike ikpughe data. ZEC kacha mma n'ịlụso mwepụta data ọgụ, mana nke ahụ apụtaghị na ị ga-eji ya n'echeghị echiche. Ndị a bụ ụfọdụ ihe ị ga-achọ izere mgbe ị na-eji ZEC eme azụmaahịa.
N'ikpeazụ, ihe kacha mma ime na ZEC gị bụ ijide ya na e-akpa ego nke e chebere echebe, ime azụmaahịa n'etiti Adreesị akpa ego nke e chebere echebe, ma kpachara anya n'otú i si eji ZEC n'ihu ọha (ya bụ, n'ụlọ ahịa kọfị). Idozi Nzuzo [privacy] chọrọ oke ọrụ dịịrị mmadụ.