Edit this page on GitHub (opens in a new tab)
Ndị mmadụ na-eji ZEC eme Azụmahia n'ụzọ dị irè ma dị nchebe, na ugwo [fees] dị ala. Nke e chebere echebe Zcash na-ahụ na Azụmahia [transactions] na-anọgide na Nzuzo [privacy], ma na-enyekwa ha nhọrọ ịkekọrịta Adreesị akpa ego [address] na ozi Azụmahia ma ọ bụrụ na ha họrọ ime otú ahụ. Azụmahia nzuzo, “Z-Z”, na-apụta na blockchain [blockchain] ọhaneze ka a mara na ha mere nakwa na akwụla ugwo. Mana, Adreesị akpa ego, ego Azụmahia na oghere memo bụcha Nzobe ederede [encrypted] ma ọhaneze enweghị ike ịhụ ha.
Ndị mmadụ nwekwara ike iji ZEC chekwaa akụ n'ime akù siri ike nke na-echebe Nzuzo. A ga-enwe naanị nde 21 nkeji ZEC, nke pụtara na akù ahụ nwere ọnụọgụ a kapịrị ọnụ. Ozugbo e tinyere nde 21 nke ZEC n'ime mgbasa site na ịgwụputa n'ime mgbasa, akù ahụ ga-abụ nke na-emegide mbufụt ego. Akù ndị na-emegide mbufụt ego bụ ezigbo nchekwa pụọ na mbufụt ego ma ọ bụrụ na ndị nche ọnụ ụzọ etiti abawanye ego mba.
Ndị mmadụ nwere ike iji oghere memo dị na Azụmahia Z-Z nke e chebere echebe ziga ozi e ji Nzobe ederede zuru ezu chebe. Iji zipu memo, ndị ọrụ ga-emerịrị Azụmahia ma kwụọ ugwo Azụmahia, nke na-erughị $0.01.