ZecHub
Malite Ebe a
Malite njem mmụta Zcash gị
ZEC bụ ego dijitalụ dabere na blockchain Zcash. Ọ bụ ihe kacha yie ego nkịtị n’ịntanetị. Ọ bụ ezie na o nwere ọtụtụ atụmatụ yiri nke Bitcoin, ọ na-edozi nnukwu adịghị ike Bitcoin site n’ime ka ndị ọrụ nwee ike ịme Azụmahia ego nzuzo zuru oke.
ZEC na-enye ndị mmadụ ohere izipu data n’enweghị ikikere. Inwe usoro ego peer-to-peer, permissionless na-enye ndị mmadụ ikike ịchekwa uru, ma ọ bụ iso ndị ọzọ zụọ ahịa, n’enweghị ịdabere n’aka ụlọ ọrụ centralized. ZEC na-enyere ndị mmadụ aka ịhọrọ mgbe ha chọrọ ikpughere ndị ọzọ ozi gbasara ego ha.
Zcash bụ mmejuputa protocol “Zerocash”. Ọ bụ ledger open-source, dabere na blockchain, nke nwere usoro zero-knowledge proving dị mgbagwoju anya. Dabere na code Bitcoin, ọ bụ ọkachamara n’inye ọkwa Nzuzo dị elu site n’usoro proving ya nke na-echekwa nzuzo nke metadata Azụmahia. N’obi ya, Zcash bụ nwe data nzuzo nke a na-ebufe n’enweghị ikikere mgbe e mere Azụmahia.
Zcash na-edozi nnukwu adịghị ike Bitcoin; nwe na mbufe data nzuzo. N’ụwa ebe a na-anabata ngwa blockchain na cryptocurrencies n’ụzọ sara mbara, Azụmahia pseudonymous anaghịzi ezu iji chebe Nzuzo ndị ọrụ. A na-eji ngwa surveillance eme nyocha Azụmahia blockchain n’ụzọ sara mbara karị.