Edit this page on GitHub (opens in a new tab)
Brave: Otu n'ime ihe nchọgharị kachasị ama na nke kachasị nchebe n'ahịa taa. Ọ na-egbochi mgbasa ozi na ndị na-esochi na-emebi Nzuzo [privacy]. Ọ na-egbochi nchekwa data nke ndị ọzọ.
Mullvad: Ihe nchọgharị weebụ lekwasịrị anya na Nzuzo, nke e mepụtara site na mmekorita n'etiti Mullvad VPN na ọrụ Tor. E mepụtara ya iji belata nleba anya na mkpisiaka dijitalụ
Tor: Ihe nchọgharị a na-egbochi plugins dịka Flash, RealPlayer, QuickTime, na ndị ọzọ: enwere ike iji ha kpughee Adreesị IP gị. Anyị anaghị akwado ka ị wụnye add-ons ma ọ bụ plugins ndị ọzọ n'ime ihe nchọgharị Tor
Mgbe ị na-ahọrọ ihe nchọgharị weebụ, e nwere ihe ole na ole ị ga-eburu n'uche: A na-achọpụta adịghị ike na Nchekwa [security] na exploits mgbe niile. Enwere ike ịchọpụta ụfọdụ ihe nchọgharị n'otu ụzọ ma ọ bụ ọzọ, mana e nwere ihe nchọgharị na-enye ndị ọrụ ohere ịchọgharị n'amaghị aha — ihe nchọgharị Tor dịka ọmụmaatụ.
Mkpisiaka dijitalụ [Fingerprinting]: Ọ bụrụ na ịchọrọ idebe ihe nzuzo, dịka softwares arụnyere na ngwaọrụ gị, nhazi hardware, na ndị ọzọ, tụlee ịchọ ihe nchọgharị weebụ na-akwado atụmatụ iguzogide mkpisiaka dijitalụ.
Nnwale HTTPS [HTTPS Test]: Ihe nchekwa ọzọ a ga-atụle mgbe ị na-ahọrọ ihe nchọgharị weebụ bụ protocol Nnwale HTTPS nke na-enyere aka na Nzobe ederede [encryption] njikọ website ma na-ezobe cookies, URLs na ụdị metadata ndị ọzọ dị mkpa. Site na HTTPS, njikọ ahụ ezoro ezo, ọ nweghịkwa ndị ọzọ nọ na network nwere ike ịgụ ọdịnaya a na-ebufe n'etiti server na ihe nchọgharị gị.
Nchedo Cookie Nleba Anya [Tracking Cookie Protection]: Ọzọkwa, nnukwu akụkụ nke ibe weebụ dị na world wide web nwere ndị na-esochi zoro ezo nke ndị ọzọ; ndị na-esochi ndị a na-agụ ma na-ede cookies n'ihe nchọgharị gị. Cookies ndị a nwere ike ibute ihe ọjọọ n'ihi na enwere ike iji ha soro nchọgharị gị n'ofe websites; iji gbochie nleba anya a, họrọ ihe nchọgharị weebụ na-egbochi cookies nchọgharị amaghị ama.
Nnwale Nduzi [Navigation Test]: Ka ị na-esi n'otu ibe weebụ gaa na nke ọzọ, ị ga-ahụ ọtụtụ links (ụfọdụ bụ internal links ebe ndị ọzọ na-eduga na website ọzọ). Ka ị pịa links ndị a, ụfọdụ browser APIs na-enye saịtị mbụ ohere ikwurịta okwu na saịtị nke abụọ. Iji dozie nke a, họrọ ihe nchọgharị weebụ na-egbochi websites ikekọrịta data nleba anya mgbe ị pịrị link. Mgbe ị na-ahọrọ ihe nchọgharị nke ị chere nwere ike izute mkpa gị, gbaa mbọ hụ na ọ na-enye atụmatụ Nzuzo siri ike na atụmatụ dị mkpa dịka ndị na-egbochi mgbasa ozi arụnyere n'ime ya na ndị ọzọ. Ọzọkwa, ọtụtụ n'ime ihe nchọgharị weebụ ndị a na-akwado extensions na add-ons, na mgbe ụfọdụ extensions ndị a nwere ike ibute ihe ize ndụ Nchekwa; gbaa mbọ hụ mgbe niile na ị wụnyere extensions ndị a site na ecosystem echekwara ma ọ bụ ebe a tụkwasịrị obi.
Ihe nchọgharị Brave na-emepe ụzọ maka ecosystem web3. Kedu ka ọ si eme ya? Ugbu a, enwere ike iji karịa 2 nde unstoppable domains gosi websites decentralized. Site na atụmatụ Nchekwa siri ike nke ihe nchọgharị Brave, ndị mmadụ nwere ike nyochaa ịntanetị n'enweghị onye na-esochi ha. Brave na Zcash na-ejikọ aka iweta ngwá ọrụ Nzuzo ọhụrụ na ecosysem Web3. Maka uru ka ukwuu, Brave ga-ejikọta ngwa ngwa na protocol Zcash site na e-akpa ego crypto arụnyere n'ime Brave iji gbanwee Azụmahia [transaction] crypto — Mmekọrịta a ga-eme ka ndị ọrụ nwee ike ichekwa, zipụ, ma nata ZEC n'enweghị nsogbu, tinyere ego crypto ndị ọzọ. Mmekọrịta dị n'etiti ihe nchọgharị weebụ Brave na Zcash ga-agbanwe ọnọdụ n'ezie, n'ihi na ndị ọrụ ga-enwe ikike dị ukwuu n'ọrụ Web3 ha.
Ihe ọzọ na-adọrọ mmasị banyere mmekọrịta ihe nchọgharị Brave na Zcash bụ atụmatụ izipu ozi na decentralized nkeonwe; Brave, ECC, na ndị otu Zcash Foundation Filecoin na-emepe ụzọ maka atụmatụ dabere na Nzuzo n'ihe nchọgharị Brave — mmekorita a bu n'obi ịnye ozi nzuzo na nnyefe media site na protocol Zcash. N'ebe a, Interplanetary File System (IPFS) ga-arụ ọrụ dị mkpa n'inye ikike nchekwa echekwara maka ọdịnaya ezoro ezo.