Edit this page on GitHub (opens in a new tab)
Zcash Community GrantsMmemme Zcash Community Grants na-enye ndị otu nọọrọ onwe ha na-abanye n'usoro ihe dị ndụ nke Zcash ego, ka ha rụọ nnukwu mmepe na-aga n'ihu (ma ọ bụ ọrụ ọzọ) maka ọdịmma ọha nke usoro ihe dị ndụ nke Zcash.
Otu kọmitii, nke mmadụ ise mejupụtara ugbu a, na-ahụ maka Zcash Community Grants. Obodo a na-enyocha ma na-akwado akwụkwọ arịrịọ ikike sitere n'aka ndị otu nke atọ chọrọ iwulite n'elu protocol nke Zcash. Ozi ndị ọzọ gbasara Ndị otu
Ọrụ ndị e kwadoro n'oge na-adịbeghị anya site na ZCG bụ Zcash Ngwá akụ nke e chebere echebe (ZSA) nke ndị otu QEDIT na-edu. Iwebata DeFi na ZEC site na Zcash, yana protocol Kwụọ ụhwọ [payment] ọhụrụ na-agbakwunye atụmatụ ndị ọzọ na mainnet nke Zcash.
Akwụkwọ ngosi dị mkpirikpi nke Zcash Media, nke nwere ndị Zcasher a ma ama dịka Edward Snowden, Zooko na Deirdre Connolly, nwere ebumnuche imepụta vidio dabara adaba, na-atọ ụtọ, na-akụzi ihe ka e kesaa ya n'ọtụtụ ebe.
Mmekọrịta hardware wallet nke Ledger iji kwado Azụmahia [transaction] nke e chebere echebe nke Sapling n'uju; nke a na-enye ohere ka echekwa Zcash na nzuzo na n'enweghị nsogbu. Ndị otu Zondax rụrụ nke a.
SDK maka usoro Kwụọ ụhwọ nke e chebere echebe, nke dị mfe iji otu pịa, na usoro ebe a na-ere ahịa maka ụlọ ahịa nkịtị, nke ZGo na-arụ.
Mmemme Onye nnọchi anya zuru ụwa ọnụ na-enyere Zcash aka inweta nnọchite anya sara mbara n'ụwa niile nakwa maka mmemme obodo a na-eme n'onwe mmadụ gburugburu ụwa.
Kọmitii ikike nke Zcash enyochala ọtụtụ ọrụ ndị ọzọ; lee Ndepụta zuru ezu, emelitere nke ọrụ ndị e nyefere.
Zcash Community Grants bụ ọgbakọ nọọrọ onwe ya na Electric Coin Company na Zcash Foundation.
Zcash Community Grants na-enweta 8% nke onyinye block, n'okpuru usoro ego e guzobere na NU6.1 site na ZIP 1016. Mgbasa ahụ malitere mgbe mgbasa mbụ nke ZIP 1015 kwụsịrị, ma ọ ga-adị ruo halving nke atọ nke Zcash na block 4,406,400 n'okpuru oghere block dị ugbu a. ZCG na-eji ego ndị a akwado ndị otu nọọrọ onwe ha n'ofe usoro ihe dị ndụ nke Zcash.
Zcash mmepe na Gọọmentị governance
Mepụta aro doro anya gụnyere:
Issue nke GitHub bụ ndekọ gọọmentị nke akwụkwọ arịrịọ.
Rịba ama: GitHub bụ isi mmalite nke ndekọ; forum bụ maka mkparịta ụka ọhaneze.