

Edit this page on GitHub (opens in a new tab)
E mepụtara nkuzi mkpirikpi a n'oge DWeb Camp 2023 site n'aka otu ndị ọrụ ibe na ndị ọrụ afọ ofufo. Ebumnuche nke mmemme a bụ iji ngwaọrụ ekwentị amamihe [smart phone devices] ejikọrọ na netwọkụ MESH na-anọghị n'ịntanetị mee ndekọ vidiyo na mgbasa ozi ọnụ.
Anyị na-eji ngwanrọ mepere emepe abụọ OBS Studio (Open Broadcaster software) na VDO.Ninja. Enwere ike ibudata ngwanrọ ndị a ma jiri ha rụọ ọrụ n'ime kọmputa gị.
OBS Studio bụ ngwanrọ n'efu ma mepere emepe maka ndekọ na mgbasa ozi ndụ [live streaming], nke dị maka sistemụ arụmọrụ dị iche iche. E wepụtara ngwanrọ a mbụ na 2012, ọ nwekwara ọtụtụ ndị na-akwado ya n'etiti obodo mgbasa egwuregwu na ndị na-emepụta ọdịnaya vidiyo nọọrọ onwe ha.
Ihu onye ọrụ OBS Studio nwere ike iyi ihe na-atụ egwu nye ndị na-eji ya nke mbụ. E kewara OBS Studio n'ime windo abụọ, “Nlele [Preview]” na “Mgbasa [Broadcast]”. Windo nlele na-egosi vidiyo dị (kamera dị iche iche dịka webcam, Iriun Webcam, OBS Virtual Camera, Video na Browser source) a na-akpọ “Scenes”, ebe “Broadcast” na-egosi mgbasa ozi ndụ.
Iji bubata mgbasa kamera dịpụrụ adịpụ site na VDO.ninja n'ime OBS Studio, bido site n'ịgbakwunye “Browser Source” ọhụrụ site na “Sources > Add > Browser”. N'ime windo ọhụrụ ahụ, ị nwere ike inye URL isi mmalite sitere na VDO.Ninja ma họrọ “Make source visible”.
Ugbu a, ị nwere ike ịmalite ịgbasa mgbasa dịpụrụ adịpụ.
VDO.Ninja bụ ngwa weebụ n'efu ma mepere emepe nke na-enye gị ohere ịgbanwe ngwaọrụ mkpanaka gị ka ọ bụrụ kamera mgbasa ozi ndụ. Enwere ike ibudata ngwanrọ a ma tinye ya n'ime kọmputa mpaghara gị, ma ọ bụ jiri ụdị n'ịntanetị na https://vdo.ninja. ozugbo.
Ihu VOD.Ninja dị mfe; naanị mepee VDO.Ninja n'ime ihe nchọgharị weebụ ngwaọrụ mkpanaka gị ma họrọ “Add your camera to OBS”. Ị ga-ahọrọzi kamera na ngwaọrụ ọdịyo gị site na ndepụta ngwaọrụ ma pịa “Start”. Mgbe ahụ, ị ga-enweta njikọ “view” nke ị nwere ike itinye na OBS Studio.
Bido site na ịga VDO.ninja site n'ihe nchọgharị weebụ gị na desktọọpụ/laptọọpụ.
Iji mepụta ime ụlọ ọhụrụ ma duzie mgbasa ozi ndụ oku obodo nke gị, pịa Create a Room.
Ihuenyo na-esote ga-arịọ maka ozi ndị bụ isi iji hazie ime ụlọ gị.
Ozugbo e mepụtara ime ụlọ, onye nduzi nwere ọtụtụ nhọrọ njikwa dị na ihuenyo na-esote.
Mgbe ndị mmadụ sonyeere ime ụlọ gị, gị, onye nduzi, ga-ahụ nhọrọ isi mmalite na njikwa niile na-apụta yana vidiyo na ọdịyo ha.
Ị nwere ike iji kọmputa nkeonwe nwere ezigbo kaadị eserese na ebe nchekwa buru ibu, ma ọ bụ jiri encoders ngwaike Teradek VidiU.
Enwere ụfọdụ plugins ndị obodo nyere aka mepụta nke yiri ka ha na-enye ụdị atụmatụ ahụ. https://github.com/eddieoz/OBS-live-translation
Ee, OBS na-akwado Lua na scripting Python. Ọzọkwa, JavaScript maka Overlays na webviews.
Nke ahụ dịịrị gị, onye mmepụta!
Nke a dabere nke ukwuu na ebe ị na-agbasa ozi. Dịka ọmụmaatụ, YouTube nwere ike inwe igbu oge nke nkeji 1 ma ọ bụ karịa n'ihi nhazi vidiyo a na-eme na sava ha tupu agbasa ya.
Jiri encoder ngwaike ma ọ bụ jiri stream yard https://support.streamyard.com/hc/en-us/articles/360056350852-How-to-Use-OBS-Virtual-Camera-with-StreamYard ma ọ bụ RiverSide.FM
Oge Ọfịs [Office Hours]: Obodo mgbasa ozi na mmemme dijitalụ https://alex4d.com/notes/item/media-and-digital-event-community