Edemede nchọpụta a na-enyocha otú mgbama on-chain mbụ maka Zcash, karịsịa mmegharị whale na mgbama echiche ọha n'elu nyiwe dịka X, si enwe mmetụta dị mkpa n'ike ọganihu nke ZEC. Zcash bụ cryptocurrency lekwasịrị anya na Nzuzo [privacy] nke sitere na codebase Bitcoin, nke nnukwu ọhụụ ya bụ itinye ledger e zoro ezo site n'iji proof zero-knowledge.
Messari ZEC Dashboard na nyocha mkparịta ụka X bụ otu n'ime ngwá ọrụ [tools] eji ahụ ma nnukwu mmegharị Zcash nwere njikọ na ọtụtụ tweet na mmasị na-arị elu n'ịntanetị. Ebe ọzọ a na-elekwasị anya bụ otú ọrụ obodo Zcash, dịka e-akpa ego [wallet], mmemme na mmepe, si emetụta mmegharị Zcash n'ahịa.
A na-enyochakwa usoro gara aga nke ZEC ma jiri ha tụnyere mkpụrụ ego Nzuzo ndị ọzọ; etu ngalaba na azụmahịa dị iche iche si amata ma nakwere ha na-enyere inye ọnọdụ a ga-adabere n'ịghọta mgbanwe ndị ahụ. Ọ bụghị maka ịkọ nkọ n'enweghị ntọala banyere ọnụahịa ZEC ma ọ bụ ibu amụma dị mfe, kama ọ bụ ịtụle mgbama n'oge iji gosi mmasị na-arị elu, nnukwu mgbanwe ma ọ bụ ọrụ obodo tupu ọha mmadụ buru ibu ahụ ha.
Nkà na ụzụ blockchain [blockchain] na-arụ ọrụ n'ụzọ ọhụrụ, ọrụ cryptocurrency na-edugakwa n'ahụmịhe pụrụ iche. Site n'otú Azụmahia [transaction] si eme ruo n'otú ha si akpata mgbanwe dị ịrịba ama n'omume ahịa na echiche, a pụrụ ịmụ mgbanwe ahịa ndị na-adọrọ mmasị; uru na mfu bụ ahụmịhe a na-ahụ ozugbo.
Metiriki on-chain mbụ n'ime ọrụ guzo dịka otu n'ime ihe ngosi mbụ na metiriki dị ike na-ekpughe ntụziaka na mmegharị ahịa, yana ọrụ ndị itinye ego na mgbanwe ndị nwere ike ime n'ọdịnihu dị nso n'ụwa crypto. Ọzọkwa, ọ bụrụ na achọpụta ha n'oge, mgbama ndị a nwere ike inyere ndị itinye ego inweta uru, ọkachasị mgbe ejikọrọ ha na ihe ndị na-adịghị on-chain dịka nyocha echiche mgbasa ozi ọha. Dịka Messari ZEC Dashboard, Coin Metrics na Blockchair siri kwuo, nyocha ọrụ netwọk ZEC na-enye nghọta enwere ike ime ihe banyere ma nnukwu mmegharị whale kwekọrọ na mmụba ọrụ ọha dịka olu tweet na mmasị ka ukwuu n'ịntanetị. Kpọmkwem, eserese Messari na-ekpughe mmụba doro anya n'olu Azụmahia on-chain kwa ụbọchị na mbata ego exchange n'oge sitere na Julaị 1 ruo 22, 2025, nke ruru elu gburugburu Julaị 22; nke dakọtara na mkparịta ụka ọha dị elu na mmegharị ọnụahịa. Data Blockchair na-egosi na òkè ZEC a jidere n'ime Adreesị akpa ego nke e chebere echebe [shielded] sitere n'ihe dị ka 18 % ruo 20 % n'ime otu oge ahụ, na-egosi iji Azụmahia na-echekwa Nzuzo eme ihe nke ukwuu. (Lee Ọnụọgụgụ 1)
(Isi mmalite: Blockchair (2025). Pasent ọkọnọ nke e chebere echebe maka Julaị 1-22, 2025.)
Na mgbakwunye, usoro netwọk ọha Coin Metrics na-akwado na Adreesị akpa ego ndị na-arụ ọrụ kwa ụbọchị na metiriki ọkọnọ e chebere echebe ha abụọ gbasoro ụzọ ịrị elu n'etiti Julaị, na-eme ka ntụnyere ọnụọgụgụ dị n'etiti omume on-chain na ihe ngosi ọha kwe omume. (Lee Ọnụọgụgụ 2)
(Isi mmalite: Coin Metrics (2025). Adreesị akpa ego ndị na-arụ ọrụ kwa ụbọchị maka Julaị 1-22, 2025.)
Data ndị a niile na-egosi mmegharị mkpụrụ ego, nnabata Nzuzo na nsonye ndị ọrụ; mmụba n'olu on-chain buru ibu na mbata ego exchange na-atụ aro na whale nọ n'ọrụ, ikekwe na-ebuga ego ma ọ bụ na-akwadebe maka mmetụta ahịa; mmụba ọkọnọ e chebere echebe na-egosi mmasị na-aga n'ihu n'Azụmahia Nzuzo kwalitere, ọbụna n'oge nlebara anya dị elu, ọnụ ọgụgụ Adreesị akpa ego ndị na-arụ ọrụ na-arị elu na-egosikwa na iji netwọk na-agbasawanye n'akụkụ mmegharị whale ndị a na ọchịchọ Nzuzo. (Lee Ọnụọgụgụ 3)
(Isi mmalite: ZecHub (2025). Eserese dashboard ZecHub maka 2016- 2025)
Zcash bụ otu n'ime cryptocurrency e mepụtara n'ebumnuche Nzuzo onye ọrụ, nke na-eji proof zero-knowledge (zk-SNARKs) ma sitere na code Bitcoin dịka fork; ndị ọrụ nwere ike ime ugbu a Azụmahia Oha [transparent] na Azụmahia nke e chebere echebe. Ọ bụ ezie na ebumnuche ya bụ inyere ichekwa Nzuzo onye ọrụ, inwe ya nke ukwuu na-eme ka ọ sie ike ileba mgbama anya nke nwere ike ime trading na itinye ego ka mfe. Otú ọ dị, ọ gaghị ekwe omume.
N'adịghị ka Monero na DASH, ndị a na-ejikọkarị dịka “mkpụrụ ego Nzuzo,” DASH ahapụla n'ihu ọha nhazi mkpụrụ ego Nzuzo na-esochi mgbanwe atụmatụ na nkọwa iwu na-agbanwe agbanwe (Cointelegraph, 2024) . ZEC ka na-eche asọmpi na nlebanya, ma a pụrụ ịtụ ike ọganihu ya site na ọrụ on-chain, njikọ mmegharị whale, olu tweet, na nsonye netwọk na-enweghị ịdabere naanị na ntule ọnụahịa.
Ọrụ on-chain na-ezo aka na mmekọrịta niile na-eme ozugbo n'elu blockchain, dịka mbufe e-akpa ego gaa n'e-akpa ego, Mgbawe [swap] token, mmekọrịta smart contract, nkwụnye na iwepụ ego n'aka exchange, imepụta ma ọ bụ mbufe NFT, na mmemme Mkpọchi ego dijitalụ [staking]/imeghe ego. A pụrụ ịchọpụta ụkpụrụ omume ndị isi so na ya, ọkachasị whale, otu ndị ahịa nta, onye mmepụta [developer], ma ọ bụ e-akpa ego ụlọ ọrụ mgbe a nyochara data a, ọ ga-ekwe omume ịghọta nke ọma otú ha si emekọrịta n'ịchọpụta ahịa.
Dịka Messari ZEC Dashboard (Messari) siri kwuo, n'etiti Julaị 1 na Julaị 22, 2025, e nwere Azụmahia 12 karịrị 1,000 ZEC, nke kasị ukwuu hà 5,200 ZEC (Coin Metrics, 2025). Olu ZEC ndị a e mechiri oke so na ọrụ mbata ego exchange a ma ama, na-atụ aro ọrịre nwere ike ime ma ọ bụ nhazigharị pọtụfoliyo.
N'otu oge ahụ, Azụmahia nke e chebere echebe, bụ akụkụ dị mkpa nke usoro Nzuzo Zcash, ka na-enweta nnabata bara uru. Ka ọ na-erule Julaị, ihe dị ka 20% nke mkpokọta ọkọnọ ZEC dị n'ime Adreesị akpa ego nke e chebere echebe. (Blockchair 2025) (lee Ọnụọgụgụ 4)
(Isi mmalite: Blockchair (2025). Pasent ọkọnọ e chebere echebe site na Julaị 1-22, 2025, na-egosi mmụba site na ~18% ruo ~20%.)
N'ụzọ na-adọrọ mmasị, olu Azụmahia nke e chebere echebe gbagoro 8% site n'ọnwa gara aga, na-eme ka ọchịchọ kwụsiri ike maka Nzuzo ego ka ukwuu pụta ìhè. N'ozuzu, usoro ndị a na-atụ aka na ecosystem Nzuzo na-eto eto, ebe azụmahịa na ndị ọrụ nwere mmasị na Nzuzo na-emetụta n'ụzọ dị irè otú netwọk si arụ ọrụ.
N'ime Julaị 2025, nkezi Olu Tweet nke kpọrọ ZEC aha dị gburugburu post 450 kwa ụbọchị, nke ruru elu 1,200 na Julaị 22, ụbọchị Azụmahia whale kasị ukwuu. Nkwalite teknụzụ na atụmatụ Nzuzo ZEC dọtara echiche dị mma, dịka akụkọ influencer dịka @MarcoPoloMaps kwuru. Data a na-enye ihe akaebe na ọrụ whale nwere ike ịkpalite mmekọrịta obodo n'ịntanetị.
Atụmatụ Nzuzo na nkwalite teknụzụ ọhụrụ, ya bụ nkwalite protocol Zcash 6.2.0 na mwepụta e-akpa ego Zashi 2.0 (Zcash Foundation Blog, Electric Coin Co. Release Notes), wetara echiche dị mma n'ime 55% nke tweet 13,500 a nyochara. 30% nke tweet ahụ bụ ndị na-anọpụ iche, na-elekwasị anya n'akụkọ ma ọ bụ nyocha teknụzụ, ebe 15% bụ ndị na-adịghị mma, nke jikọtara nke ukwuu na ọnọdụ iwu ntule dịka iwu EU a tụrụ aro igbochi mkpụrụ ego Nzuzo maka 2027.
N'ịbụ ndị nwere ndị na-eso ha karịrị 10,000, akaụntụ dịka @MarcoPoloMaps nyere otu ụzọ n'ụzọ anọ nke mkpokọta olu tweet, ya mere ha dị mkpa n'usoro ahụ. Ka nkwalite 6.2.0 Zcash na mwepụta 2.0 Zashi si dọta nlebara anya, mkparịta ụka ha gbasara ihe omume ndị a kwalitere ezi mmetụta obodo. Data on-chain kwadoro mmụba a hụrụ n'ọrụ ndị ọrụ, ọnụ ọgụgụ Adreesị akpa ego na-arụ ọrụ kwa ụbọchị ruru elu na 3,200; mmụba 15% nke dabara nke ọma na oge Azụmahia whale dị elu.
A hụrụ nyiwe ndị ọzọ dịka Discord, Reddit, na Community Hub Zcash iji nweta nghọta banyere echiche ndị ọrụ na otú ndị mmadụ siri arụ ọrụ. A nyochara otú ndị ahịa si anabata ZEC, ọkachasị iji ya n'ime ngwọta Kwụọ ụhwọ [payment] dịka Brave Wallet na Zashi. Na mgbakwunye na nke ahụ, a lere ọganihu mmepe ọrụ ahụ anya site na onyinye GitHub na nkwalite netwọk ọhụrụ, gụnyere mwepụta Zcash v6.2.0.
A hụrụ njikọ siri ike n'etiti Azụmahia buru ibu na mmụba ọrụ tweet. Nke a yiri ka ọ na-egosi na mgbe whale mere mmegharị, ọ na-adọta nlebara anya nke ọtụtụ mmadụ n'ahịa. Enwekwara njikọ na-agafeghị oke na-egosi na mgbe echiche ọha dị mma, ọnụ ọgụgụ Azụmahia nke e chebere echebe na-adịkarị na-eto, na-atụ aro na mkparịta ụka gbasara Nzuzo nwere ike ịkwalite ezigbo ọrụ on-chain.
N'ileba anya na Obodo, Nnabata, na Mmepe, Community Hub Zcash mere ka mmụba obi ụtọ sitere n'aka ndị nkịtị pụta ìhè, nwere ndị òtù na-arụ ọrụ karịrị 2,800 na Discord na ndị debanyere aha 2,000 na Reddit. N'ụzọ na-adọrọ mmasị, nsonye obodo wulitere 12% mgbe a malitere Zashi 2.0, ọtụtụ mkparịta ụka lekwasịrị anya n'ọrụ ọhụrụ Nzuzo na otu a ga-esi merie ihe mgbochi iwu. (Lee Ọnụọgụgụ 5)
(Isi mmalite : Shawn; Onye nhazi isi Zcash Community Forum (2025). Eserese na-ekpuchi April 9 ruo May 9, 2025. )
Obodo, Nnabata, na Mmepe ebe Community Hub Zcash gosipụtara ịnụ ọkụ n'obi sitere n'aka ndị nkịtị na-eto eto. N'akụkụ nnabata, njikọta ndị ahịa ka nwere oke ma bụrụkwa ihe a ma ama. Ọ bụ ezie na iji ya n'etiti ndị ahịa ụwa dị ala, nke a tụrụ ihe dị ka 120, njikọta ZEC n'ime Brave Wallet na nnwale zk-proof na Google Wallet n'April na May 2025 n'otu n'otu, kwalitere nnọpụta ya. Ọrụ Electric Coin Company na Zcash Foundation gosipụtara na nkeji afọ nke abụọ nke 2025 na-egosi ọrụ na-adịgide adịgide. Commit GitHub karịrị 350 kpughere nnukwu mmekorita na ọrụ akụrụngwa dị mkpa dịka codebase Zedrab na e-akpa ego Zallet, na-egosi obodo teknụzụ na-arụ ọrụ nke ecosystem Zcash yana eserese ndị ntinye aka.
Iji nyochaa mgbanwe ugbu a nke Zcash n'ezie, ọ kacha mma inyocha echiche onye ọrụ ka oge na-aga ma jiri ọnọdụ akụkọ ihe mere eme Zcash tụnyere mkpụrụ ego Nzuzo ndị ọzọ. Nnyocha a ga-akọwa mmegharị ọnụahịa akụkọ ihe mere eme ZEC, dịka elu ahịa nke 2017 na ihe omume halving block nke 2020, na ntụnyere ihe ngosi on-chain na ọha na Monero (XMR) na DASH (DASH) (dịka, olu Azụmahia, ogo market cap, na ọrụ ọha).
Ndekọ ọnụahịa ahịa kasị elu na njedebe 2017 dabara na mmụba ahịa n'ozuzu n'ahịa crypto, ihe omume halving 2020 Zcash bụkwa isi ihe na-amachi ọkọnọ ZEC. Banyere ụfọdụ mmegharị whale na Julaị 2025, ọ dịghị ukwuu ma e jiri ya tụnyere usoro ahịa gara aga n'ihe gbasara ọrụ on-chain a na-ahụ anya (ya bụ, ha agbanweela uru n'ezie, anyị nwere ike ịhụ naanị ihe ha na-eme site na mkparịta ụka ọha ma ọ bụ ndekọ ọnọdụ kwa ọnwa). N'etiti mkpụrụ ego Nzuzo, Monero nwere uru site n'inwe obodo ndị ọrụ dị ndụ nwere mmekọrịta onye ọrụ kwa ụbọchị na-eju afọ. Zcash na-adọta nlebara anya site na mmụba dị elu n'Azụmahia nke e chebere echebe.
Ihe malitere idọta nlebara anya ka ukwuu n'ebe Zcash nọ n'ime ọnwa ndị na-adịbeghị anya abụghị naanị mmụba Azụmahia whale ma ọ bụ mkparịta ụka obodo n'ịntanetị, kama ọ bụ ụzọ ZEC siri gafee ókè nke ya. Njikọta na akụrụngwa Intents NEAR emepeela ụzọ maka Mgbawe enweghị mgbochi na permissionless n'etiti ZEC na akụ dịka Bitcoin, Ethereum, na NEAR n'onwe ya. Maka oge mbụ, Azụmahia na-echekwa Nzuzo nwere ike ịgafe chain na-enweghị nsogbu exchange ma ọ bụ ibu ugwo [fee] dị arọ. Nye ndị ọrụ Zcash, nke a pụtara karịa ịdị mfe; ọ bụ òkù dị nwayọọ maka mkparịta ụka sara mbara ebe usoro dabere na ebumnuche na ego nkeonwe na-ezukọ. Hackathon nke kara akara mmekorita a abụghị naanị mmemme teknụzụ kama ọ bụ mgbama ebumnuche. Ndị mmepụta na ndị na-akwado Nzuzo zukọrọ iche n'echiche ụdị ọdịnihu ZEC nwere ike ịdị n'ime cross-chain. Ọnọdụ dị na forum mgbe nke a gasịrị nwere mmetụta nke ọganihu. Ndị mmadụ kwuru maka nke a dịka mmalite nke usoro ohere ọhụrụ na ohere maka Zcash ịkwụsị ịbụ nke a na-emeso dị ka nnwale nọpụrụ iche. Kama nke ahụ, ọ na-aghọ ego nwere ike ịkwaga ebe ọ bụla liquidity dị. Ọbịbịa Maya Protocol enyela ZEC ụdị nlebara anya ọzọ. N'ebe a, nkwusi ike adịghị na Azụmahia AI mara mma kama na nkwa liquidity decentralized. Site n'itinye Zcash n'ime AMM cross-chain Maya, ndị ji ya nwere ike ịzụ ahịa n'onwe ha na-enweghị inyefe autonomy ha n'aka exchange etiti. N'oge ndị na-ahụ maka iwu na-agba mkpụrụ ego Nzuzo gburugburu ma iwepụ ndepụta aghọọla ihe a na-eme mgbe niile, nke a dị ezigbo mkpa. Nye ọtụtụ ndị nọ n'obodo, Maya dịghị ka njikọta kama dị ka eriri ndụ. Ọ bụ ncheta na ZEC ka nwere ike ịdị n'ahịa na-enweghị ihulata n'ihu ndị nlekọta akụ. Roadmap na-atụ aka n'itinye ZEC miri emi n'ime ecosystem Maya, ndị ọrụ amalitelarị ikwu maka ya dịka ụzọ isi debe ikike ego ha n'aka ha n'agbanyeghị ọnọdụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ọnụ, njikọta ndị a emeela ihe dị aghụghọ mana nke miri emi. Ha etinyela Zcash n'ime mkparịta ụka na obodo ndị ọzọ. Ndị mmepụta NEAR ndị nwere ike ha agaghị ele mkpụrụ ego Nzuzo anya ugboro abụọ na-ahụzi ya dịka onye mmekọ n'ichepụta dabere na ebumnuche. Ndị ọrụ Maya, ndị maara asụsụ liquidity na Mgbawe, na-ahụ Adreesị akpa ego nke e chebere echebe na nkà ihe ọmụma zero-knowledge maka oge mbụ. ZEC anaghịzi agwa naanị ndị kwere ekwe nke ya okwu. Ọ na-amalite inwe ụda n'ime okirikiri ọhụrụ ebe Nzuzo abụghị naanị atụmatụ kama ọ bụ bridge n'etiti netwọk, protocol, na ndị mmadụ na-eji ha.
Iji chịkọta ihe niile, ọmụmụ a na-egosi na mgbama on-chain na ọha nke Zcash, ọ bụ ezie na ha na-adị mgbe ụfọdụ aghụghọ, na-ekpughe ecosystem na-agbanwe agbanwe ma na-eto eto. E nwere oke; amaghị onye nwe e-akpa ego whale nke na-eme ka o sie ike ikpebi ma Azụmahia on-chain buru ibu bụ ọrịre ahịa ma ọ bụ naanị mmegharị ahịa, yana iwu na-agbanwe agbanwe, dịka mmachibido mkpụrụ ego Nzuzo EU maka 2027, nke nwere ike imetụtala echiche onye ọrụ; tinyere ịdabere na mgbasa ozi ọha dịka X nke eleghị anya anaghị anọchi anya echiche ndị lekwasịrị anya na Nzuzo, ndị nwere ike ịhọrọ ụzọ nkwukọrịta ndị ọzọ dabere na amaghị aha ma ọ bụ nchekwa.
Zcash nwere ike ọ gaghị enwe obodo buru ibu dịka Monero ma ọ bụ nnukwu ndị ahịa ugbu a, mana ọganihu teknụzụ ya na-aga n'ihu; dịka nkwalite protocol v6.2.0 na-emezi arụmọrụ Azụmahia nke e chebere echebe, mwepụta e-akpa ego Zashi 2.0 nke nwere iji mobile ka mma na nkwado e chebere echebe site na ndabara, na njikọta cross-chain site na NEAR Intents na Maya Protocol, na-ekewapụ ya dịka mkpụrụ ego Nzuzo na-eme ka akụrụngwa ya dị omimi nwayọọ nwayọọ ma na-agbasawanye iru ya. Ọ dị mma ịmara na Julaị 2025 kara akara nlọghachi ike maka Zcash, na-akpalite mkparịta ụka na X nwere nnukwu Azụmahia whale. Na mgbakwunye, mmụba na-adịgide adịgide n'Azụmahia nke e chebere echebe na-egosi na Nzuzo ka bara nnukwu uru nye ndị ọrụ. E nwere njikọ pụrụ iche n'etiti ihe omume on-chain na mkparịta ụka ọha, na-ekpughe otú mpaghara abụọ ahụ si emetụta ibe ha. Ọ bụ ezie na imeri ihe mgbochi iwu ka bụ ihe ịma aka, ileba mgbama mbụ ndị a anya ga-eme ka nghọta anyị banyere ụzọ ZEC nwere ike isi gaa ka mma, na-enweghị mkpa ibu amụma ọnụahịa.